Jeremiah 12

Mkpesa Jeremaya

1Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị,
mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị.
Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị:
Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma?
Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla?
2Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ;
ha na-etokwa na-amị mkpụrụ.
Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha,
ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.
3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị;
ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị.
Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu.
Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.
4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ?
Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ?
Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị
nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu.
Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị,
“Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”

Ọsịsa Chineke nyere

5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ
emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara,
i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi?
Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị,
ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?
6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị,
ararala gị nye.
Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị.
Atụkwasịla ha obi,
ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.

7“Aga m agbakụta ụlọ m
na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ.
Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya
nyefee ya nʼaka onye iro ya.
8Ihe nketa m aghọrọọla m,
ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa,
Ọ na-agbọ ụja megide m;
ya mere, m ji kpọọ ya asị.
9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị
nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m
nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya?
Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile,
mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.
10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m.
Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ,
ha emeela ka ubi m mara mma
ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.
11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu;
e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m.
Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.
12Ndị mbibi ga-ejupụta
nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara,
nʼihi na mma agha Onyenwe anyị
ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya.
O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.
13Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha.
Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla.
Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu,
nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”
14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ma banyere ndị agbataobi ọjọọ m ahụ niile, bụ ndị na-apụnara ndị m Izrel ihe nketa ahụ m nyere ha. Aga m esite nʼala ha hopu ha. Aga m esitekwa nʼetiti ha hopu ụlọ Juda. 15Ma mgbe m hopuchara ha, aga m emesịa meere ha ebere, meekwa ka onye ọbụla nʼime ha laghachikwa nʼobodo nke aka ya. Ha ga-enwetakwa ihe nketa ha niile. 16Ọ bụrụkwa na ha amụta ụzọ niile nke ndị m nke ọma, na iji aha m ṅụọ iyi, na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ dịka ha si kuziere ndị m iji aha Baal na-aṅụ iyi, aga m eme ka ha guzosie ike nʼetiti ndị m. 17Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ajụ ige ntị, aga m ehopu ha kpamkpam, laa ha nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Copyright information for IboBIU